Genesis 14

Ebram anapụta Lọt

1Nʼoge ahụ kwa, Amrafel, eze Shaịna, na Ariok, eze ndị Elasa, na Kedoloma eze Elam, na Tidal eze Goiim, 2buru agha megide Bera eze Sọdọm, na Biasha eze Gọmọra, na Shịnab, eze Adma, na Shemeba eze Zeboiim, na eze obodo Bela (ya bụ Zoa). 3Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ). 4Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi.

5Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim
Refaim Aha a Refaim pụtara ndị ọ gbaa dimkpa Jen 15:20
bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave,
6na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara. 7Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama.

8Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim, 9imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ. 10Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu. 11Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa. 12Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa.

13Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ. 14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. 15Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha.

Melkizedek agọzie Ebram

17Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze).

18Melkizedek, eze
Salem Eleghị anya, nke bụ aha ochie e ji mara obodo Jerusalem.
Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya,
19ọ gọziri Ebram sị ya,

“Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Onye kere eluigwe na ụwa.
20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu,
onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.”
Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.

21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”

22Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị 23na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’ 24Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”

Copyright information for IboBIU